Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 36:4-13 Bible Nso (IGBOB)

4. Ọ buru kwa na ọ bu jubile nke umu Israel, agātukwasi kwa ihe-nketa-ha n'ihe-nketa nke ebo ahu nke gēnwe ha: ewe gupu ihe-nketa-ha n'ihe-nketa ebo nna-ayi-hà.

5. Moses we nye umu Israel iwu n'okwu-ọnu Jehova, si, Ihe ziri ezi ka ebo umu Josef nēkwu.

6. Nka bu ihe Jehova nyeworo n'iwu bayere umu-ndinyom Zelọfehad, si, Nwoke di nma n'anya-ha ka ha gāburu nwunye; nání ọ bu ab͕uru nke ebo nke ndi bu nna-ha ka ha gāburu nwunye.

7. Ọ dighi kwa ihe-nketa umu Israel nwere gēsi n'ebo fe n'ebo ọzọ buruburu: n'ihi na umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n'ihe-nketa ebo nna-ya-hà.

8. Nwa-nwayi nwoke ọ bula, nke nēnweta ihe-nketa n'ebo nile nke umu Israel, gāburu otù nwoke sitere n'ab͕uru nke ebo nna-ya nwunye, ka umu Israel we nweta, nwoke ọ bula ihe-nketa nna-ya-hà.

9. Ọ dighi kwa ihe-nketa gēsi n'ebo fe n'ebo ọzọ buruburu; n'ihi na ebo nile nke umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n'ihe-nketa nke aka ya.

10. Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu-ndinyom Zelọfehad mere:

11. Mahla, na Tiaza, na Họgla, na Milka, na Noa, bú umu-ndinyom Zelọfehad, we buru nwunye umu umu-nne nna-ha.

12. Ọ bu ndikom nke sitere n'ab͕uru umu Manase nwa Josef ka ha buru nwunye, ihe-nketa-ha we digide n'ebo nke ab͕uru nna-ha.

13. Ndia bu ihe enyere n'iwu, na ikpé, nke Jehova nyere umu Israel n'iwu n'aka Moses n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 36