Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 33:48-56 Bible Nso (IGBOB)

48. Ha si n'ugwu Abarim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ala ihe nādighi nke Moab, n'akuku Jọdan na nso Jeriko.

49. Ha ma ulo-ikwū-ha n'akuku Jọdan, site na Bet-jeshimot rue Ebel-shitim n'ala ihe nādighi nke Moab.

50. Jehova we gwa Moses okwu n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si,

51. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu nāgabiga Jọdan ba n'ala Kenean,

52. unu gānapu kwa n'aka ndi nile bi n'ala ahu ala-ha n'iru unu, unu gāla kwa nkume-ha nile nke emere ka ha yie ihe n'iyi, onyinyo-ha nile awuru awu ka unu gāla kwa n'iyì, me kwa ka ebe di elu nile tọb͕ọrọ n'efu.

53. Unu gēnweta kwa ala ahu, biri nime ya: n'ihi na ọ bu unu ka M'nyeworo ala ahu inweta ya.

54. Unu gēketa kwa ala ahu n'ife-nzà dika ab͕uru nile unu si di; ndi bara uba ka unu gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà: ebe ọ bula nzà ahu gāmara onye ọ bula, ọ gēnwe ya; dika ebo nile nke nna-unu-hà si di ka unu gēketa.

55. Ma ọ buru na unu anapughi n'aka ndi bi n'ala ahu ala-ha n'iru unu; ọ gēru kwa na ndi unu kwere ka ha fọdu site na ndi ahu gāghọ kwa obi-ogwu n'anya-unu, ghọ kwa ogwu n'akuku-unu, ha gākpab͕u kwa unu n'ala ahu nke unu onwe-unu nēbi nime ya.

56. O gēru kwa, na dika M'chère ime ha, otú a ka M'gēme unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 33