Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 31:38-53 Bible Nso (IGBOB)

38. Ehi di kwa orú nnù uzọ anọ na nnù iri; utu aturu Jehova site na ha we di ọgu atọ na iri na abua.

39. Inyinya-ibu di kwa orú nnù uzọ atọ, na nnù iri-na-isi, na ọgu ise; utu-ha aturu Jehova we di ọgu atọ na otù.

40. Madu di kwa orú nnù uzọ abua; utu aturu Jehova site na ha we di orú madu na iri na abua.

41. Moses we nye Eleeza, bú onye-nchu-àjà, utu ahu, nke bu àjà-nbuli Jehova, dika Jehova nyere Moses iwu.

42. Moses we nara na nkera nke umu Israel, nke Moses kerara site na ihe ndikom nēbu agha,

43. (ma nkera nke nzukọ Israel, nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, di orú nnù ọgu uzọ abua na uzọ abua, na nnù atọ, na ọgu iri-na-ise,

44. ìgwè ehi di orú nnù uzọ anọ, na nnù iri,

45. inyinya-ibu di orú nnù uzọ atọ, na nnù iri-na-isi, na ọgu ise,

46. madu di orú nnù uzọ abua;)

47. Moses we nara na nkera nke umu Israel otù ihe anaputara n'ọgu ihe abua na iri, nime madu, na nime anu-ulo, ọ we nye ha ndi Livai, bú ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-obibi Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.

48. Ndi-nlekọta ndi nēlekọta usu nile nke nnù ndikom nke usu-ndi-agha abua na ọgu iri, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, we bia nso Moses:

49. ha si Moses, Ndi-orù-gi agutawo ọnu-ọgugu ndi-agha nke di n'aka-ayi, ma ọ dighi otù nwoke puru na ngukọta-ayi.

50. Ayi ewetawo kwa nso ihe iji biaru nso Jehova, ihe nwoke ọ bula chọtaworo, ihe ọla-edo, bú iyab͕a-ukwu, na ọla-aka, na nb͕a-aka-akàrà, na nb͕a-aka-nti, na ihe anēyi n'olu, ikpuchiri nkpuru-obi-ayi nmehie-ha n'iru Jehova.

51. Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we nara ha ọla-edo ahu, bú ihe nile akpuru akpu.

52. Ọla-edo nile nke àjà-nbuli ahu nke ha buliri Jehova we di orú nnù shekel uzọ abua, na nnù, na ọgu iri na asa, na iri, bú nke sitere n'aka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na n'aka ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise.

53. (N'ihi na ndikom nke usu-ndi-agha ahu lutara ihe n'agha, nwoke ọ bula ọ lutara n'onwe-ya.)

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 31