Ọla-edo nile nke àjà-nbuli ahu nke ha buliri Jehova we di orú nnù shekel uzọ abua, na nnù, na ọgu iri na asa, na iri, bú nke sitere n'aka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na n'aka ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise.