Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 31:27-41 Bible Nso (IGBOB)

27. kera ihe-nweta ahu; n'etiti ndi nēbu agha, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha, na nzukọm nile:

28. unu gānara kwa n'aka ndi-agha ahu, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha ahu, útù ibuliri Jehova: otù nkpuru-obi nime nnù nkpuru-obi na ọgu ise, nime madu, na nime ìgwè ehi, na nime inyinya-ibu, na nime ìgwè ewu na aturu;

29. na nkera-ha ka unu gānara ya, nye ya Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ọ bu àjà-nbuli Jehova

30. Na nkera nke umu Israel ka i gānara kwa otù ihe anaputara n'ọgu ihe abua na iri, nime madu, na nime ìgwè ehi, na nime inyinya-ibu, na nime ìgwè ewu na aturu, bú nime anu-ulo nile, i gēnye kwa ha ndi Livai, bú ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-obibi Jehova.

31. Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we me dika Jehova nyere Moses iwu.

32. Ma ihe-nweta ahu, bú ihe fọduru n'ihe-nluta nke ndi usu-ndi agha lutara n'agha, bu orú nnù aturu ọgu uzọ anọ na uzọ anọ, na nnù asa, na ọgu iri,

33. ehi di kwa orú nnù uzọ iteghete;

34. inyinya-ibu di kwa orú nnù uzọ asa, na nnù iri-na-abua, na ọgu iri;

35. madu kwa, bú ndinyom ndi nāmaghi ndina nwoke, madu nile di orú nnù uzọ anọ.

36. Nkera ahu, nke bu òkè nke ndi nāpu ba n'usu-ndi-agha, we di n'ọnu-ọgugu ìgwè ewu na aturu orú nnù ọgu uzọ abua na uzọ abua, na nnù atọ, na ọgu iri-na-ise:

37. útù atùru Jehova, nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, we di nnù na ọgu iri-na-atọ, na iri na ise.

38. Ehi di kwa orú nnù uzọ anọ na nnù iri; utu aturu Jehova site na ha we di ọgu atọ na iri na abua.

39. Inyinya-ibu di kwa orú nnù uzọ atọ, na nnù iri-na-isi, na ọgu ise; utu-ha aturu Jehova we di ọgu atọ na otù.

40. Madu di kwa orú nnù uzọ abua; utu aturu Jehova site na ha we di orú madu na iri na abua.

41. Moses we nye Eleeza, bú onye-nchu-àjà, utu ahu, nke bu àjà-nbuli Jehova, dika Jehova nyere Moses iwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 31