Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 30:7-16 Bible Nso (IGBOB)

7. di-ya we nu ya, ma ọ b͕ara ya nkiti n'ubọchi ọ nuru ya: nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ nile, nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, gēguzosi kwa ike.

8. Ma ọ buru na di-ya si ya, É-è, n'ubọchi ọ nuru ya; ọ gēmebi kwa nkwa-ya nke dikwasi ya, na okwu efu ahu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya, nke o ji ke nkpuru-obi-ya: Jehova gāb͕aghara kwa ya.

9. Ma nkwa nke nwayi di-ya nwuru, ma-ọbu nke nwayi achupuru achupu, bú ihe ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, o gēguzosi ike megide ya.

10. Ma ọ buru na ọ bu n'ulo di-ya ka o kwere nkwa, ma-ọbu were isọ-nsọ ke nkpuru-obi-ya ab͕u n'iṅu-iyi,

11. di-ya we nu ya, ma ọ b͕ara ya nkiti, ọ sighi kwa ya, É-è; nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u gēguzosi kwa ike.

12. Ma ọ buru na di-ya emebisia ha n'ubọchi ọ nuru ha; ihe ọ bula nke nēsi n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya puta bayere nkwa-ya nile, ma-ọbu nke bayere isọ-nsọ nke nkpuru-obi-ya, ọ gaghi-eguzosi ike: di-ya emebiwo ha; Jehova gāb͕aghara kwa ya.

13. Nkwa ọ bula, na iyi isọ-nsọ ọ bula iji weda nkpuru-obi n'ala, di-ya gēme ka o guzosi ike, ma-ọbu di-ya gēmebi ya.

14. Ma ọ buru na di-ya ab͕achie ya nkiti site n'ubọchi rue ubọchi: o mewo kwa nkwa-ya nile, ma-ọbu isọ-nsọ-ya nile, nke dikwasi ya, ka ha guzosie ike: o mewo ka ha guzosie ike, n'ihi na ọ b͕ara ya nkiti n'ubọchi ọ nuru ha.

15. Ma ọ buru na o mebisia ha mb͕e ọ nusiri ha; ọ gēbu kwa ajọ omume nwayi ahu.

16. Ndia bu ukpuru, nke Jehova nyere Moses n'iwu. n'etiti nwoke na nwunye-ya, n'etiti nna na nwa-ya nwayi, mb͕e ọ di na nwata n'ulo nna-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 30