Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 24:2-12 Bible Nso (IGBOB)

2. Belam we welie anya-ya abua, hu Israel ka ha nānọ n'ulo-ikwū-ha dika ebo nile ha si di; Mọ nke Chineke we dikwasi ya.

3. Ọ we tua ilu-ya, si,Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta,Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:

4. Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke,Onye nāhu ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile,Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:

5. Le ka ulo-ikwū-gi nile si ma nọ̄ nma, Jekob!Le ka ebe-obibi-gi nile si ma nọ̄ nma, Israel!

6. Dika ndagwurugwu di iche iche ka esetiworo ha,Dika ubi di iche iche ab͕ara ogige n'akuku osimiri,Dika osisi lign-aloes nke Jehova kuworo,Dika osisi cedar n'akuku miri.

7. Miri nēsi n'ite-miri-ya nile rùputa,Nkpuru-ya gādi kwa n'ọtutu miri,Eze-ya gādi kwa elu kari Egag,Agēbuli kwa ala-eze-ya.

8. Chineke nēme ka o si n'Ijipt puta;Ume dika ume atu ka ọ nwere:O gēripia mba di iche iche, bú ndi nākpab͕u ya,Ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ọ gēkpecha,Were kwa àkú-ya nile b͕arua ha aru.

9. Ọ makpuru, o dinara dika ọdum,Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie?Onye ọ bula nke nāgọzi gi bu onye agọziri agọzi,Onye ọ bula nke nābu gi ọnu bu kwa onye anābu ọnu.

10. Iwe Belak we di ọku megide Belam, ọ kua aka-ya abua: Belak we si Belam, Ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kpọrọ gi, ma, le, i gọziwo ha nọ̄ ub͕ò atọ ndia.

11. Ma ub͕u a, b͕alaga n'onwe-gi la n'ebe nke gi: asirim na m'gāsọpuru gi nke-uku; ma, le, Jehova eb͕ochiwo gi na nsọpuru.

12. Belam we si Belak, Ọ̀ bughi kwa ndi-ozi-gi, bú ndi i ziterem, ka m'gwara okwu, si,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 24