Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 24:18-23 Bible Nso (IGBOB)

18. Edom gābu kwa ihe-nnweta,Sia gābu kwa ihe-nnweta, bú ndi-iro-ya;Israel nēme kwa ihe-dìnkpà.

19. Otù onye gēsi kwa na Jekob zọda mba nile,Ọ geme kwa ka ndi foduru si n'obodo lapu n'iyì.

20. Ọ we hu Amalek, we tua ilu-ya, si,Mba mbu nke mba nile ka Amalek bu;Ma ikpe-azu-ya gābiaru ila-n'iyì.

21. Ọ we hu ndi-Kinait, we tua ilu-ya, si,Ebe nke nādigide adigide ka ebe-obibi-gi di,Etiye-kwa-ra akwu-gi na nkume di elu.

22. Ma otú ọ di, Ken gābu ihe irechapu ọku,Rùe ole mb͕e? Asiria gādọta gi n'agha.

23. Ọ we tua ilu-ya, si,Ewū! ònye gādi ndu site na mb͕e Chineke nēdo ya?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 24