Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 23:7-18 Bible Nso (IGBOB)

7. O we tua ilu-ya, si,N'Eram ka Belak nēsi dutem,Eze Moab si n'ugwu Iru-anyanwu dutem: si,Bia, buaram Jekob ọnu,Bia kwa, wesa Israel iwe.

8. Gini, m'gākọcha? Chineke akọchaghi.Gini kwa m'gēwe iwe? Jehova eweghi iwe.

9. N'ihi na n'elu oké nkume ndia ka m'si ahú ya,Ọ bu kwa n'ugwu ntà ndia ka m'si ekiri ya:Le, otù ndi ka ọ bu, ọ nēbi iche,Ọ dighi-agu onwe-ya n'etiti mba nile.

10. Ònye gutaworo ájá Jekob,Na ọnu-ọgugu nke otù uzọ n'uzọ anọ nke Israel?Ka mu onwem nwua, ọnwu nke ndi ziri ezi,Ka ikpe-azum di kwa ka nke ya!

11. Belak we si Belam, Gini ka i meworom? ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kutere gi, ma, le, i gọziwo ha nke-uku.

12. Ọ we za, si, Ihe Jehova nētiye n'ọnum, ọ̀ bughi nka ka m'gēlezi anya ikwu?

13. Belak we si ya, Biko, sorom je n'ebe ọzọ, ebe i gēsi hu ha; nání nsọtu-ha ka i gāhu, ma i gaghi-ahu ha nile: gi kọcha-kwa-ram ha site n'ebe ahu.

14. Ọ we kuru ya je ọhia Zofim, rue elu Pisga, o wue ebe-ichu-àjà asa, sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula.

15. Ọ si Belak, Guzo onwe-gi n'ebe a n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma mu onwem gēzute Jehova n'ebe ahu.

16. Jehova we zute Belam, tiye okwu n'ọnu-ya, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu.

17. Ọ we biakute ya, ma, le, ọ nēguzo n'akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya na ndi-isi Moab. Belak we si ya, Gini ka Jehova kwuworo?

18. Ọ we tua ilu-ya, si,Bilie, Belak, nuru kwa;Ṅam nti, nwa Zipoa:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 23