Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Obadaia 1:7-17 Bible Nso (IGBOB)

7. Rue ókè-ala ka ndi nile gi na ha nọ n'ọb͕ub͕a-ndu zipuworo gi: ndi gi na ha nọ n'udo arafuwo gi, nwe ike imegide gi; nri-gi ka ha nēme ka ọ buru ọnyà n'okpuru gi: ọ dighi nghọta di nime ya.

8. Ọ̀ bughi n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ka M'gēme ka ndi-amam-ihe la n'iyì pua n'Edom, me kwa ka nghọta la n'iyì pua n'ugwu Isọ?

9. Gi Timan, ndi-dike-gi gātu ujọ, ka ewe bipu onye ọ bula n'ugwu Isọ site n'ob͕ub͕u.

10. N'ihi ihe-ike emere nwa-nne-gi, bú Jekob, ka ihere gēkpuchi gi, agēbipu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi.

11. N'ubọchi i guzoro iche na ncherita-iru, n'ubọchi ndi ala ọzọ dọtara usu-ndi-agha-ya n'agha, mb͕e ndi mba ọzọ bata-kwa-ra n'ọnu-uzọ-ama-ya nile, fekwasi Jerusalem nzà, ọbuná gi onwe-gi nọ ka otù nime ha.

12. Ma elekwasila ubọchi nwa-nne-gi anya n'ubọchi emere ya ka ọ ghọ onye ala ọzọ, aṅu-kwa-la umu Juda n'ubọchi ila-n'iyì-ha; eme-kwa-la ka okwu-ọnu-gi di uku n'ubọchi ahuhu.

13. Abàla n'ọnu-uzọ-ama ndim n'ubọchi nhuju-anya-ha; gi onwe-gi elekwasi-kwa-la ihe ọjọ ha anya n'ubọchi nhuju-anya-ha, unu atukwasi-kwa-la aka n'àkù-ha n'ubọchi nhuju-anya-ha.

14. Eguzo-kwa-la n'abu-uzọ, ibipu ndi-ya b͕apuru ab͕apu; emechibido-kwa-la ndi-ya fọduru nye n'aka ndi-iro-ha n'ubọchi ahuhu.

15. N'ihi na ubọchi Jehova di nso n'isi mba nile: dika i meworo, otú a ka agēme gi; nmeso-gi gālaghachi n'isi-gi.

16. N'ihi na dika unu ṅuworo ihe n'ugwu nsọm, otú a ka mba nile gāṅu ihe mb͕e dum, e, ha gāṅu, loda kwa, we di ka ha akādighi.

17. Ma n'ugwu Zaion ka ufọdu ndi b͕apuru ab͕apu gādi, ọ gādi kwa nsọ; ulo Jekob gēnweta kwa ihe-nnweta nile ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Obadaia 1