N'ubọchi i guzoro iche na ncherita-iru, n'ubọchi ndi ala ọzọ dọtara usu-ndi-agha-ya n'agha, mb͕e ndi mba ọzọ bata-kwa-ra n'ọnu-uzọ-ama-ya nile, fekwasi Jerusalem nzà, ọbuná gi onwe-gi nọ ka otù nime ha.