Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Obadaia 1:10-14 Bible Nso (IGBOB)

10. N'ihi ihe-ike emere nwa-nne-gi, bú Jekob, ka ihere gēkpuchi gi, agēbipu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi.

11. N'ubọchi i guzoro iche na ncherita-iru, n'ubọchi ndi ala ọzọ dọtara usu-ndi-agha-ya n'agha, mb͕e ndi mba ọzọ bata-kwa-ra n'ọnu-uzọ-ama-ya nile, fekwasi Jerusalem nzà, ọbuná gi onwe-gi nọ ka otù nime ha.

12. Ma elekwasila ubọchi nwa-nne-gi anya n'ubọchi emere ya ka ọ ghọ onye ala ọzọ, aṅu-kwa-la umu Juda n'ubọchi ila-n'iyì-ha; eme-kwa-la ka okwu-ọnu-gi di uku n'ubọchi ahuhu.

13. Abàla n'ọnu-uzọ-ama ndim n'ubọchi nhuju-anya-ha; gi onwe-gi elekwasi-kwa-la ihe ọjọ ha anya n'ubọchi nhuju-anya-ha, unu atukwasi-kwa-la aka n'àkù-ha n'ubọchi nhuju-anya-ha.

14. Eguzo-kwa-la n'abu-uzọ, ibipu ndi-ya b͕apuru ab͕apu; emechibido-kwa-la ndi-ya fọduru nye n'aka ndi-iro-ha n'ubọchi ahuhu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Obadaia 1