Eze we sim, (nwunye eze nānọdu kwa n'akuku ya,) Rùe ole mb͕e ka ije-gi gādi? òle mb͕e ka i gālaghachi kwa? O we di nma n'anya eze, o we zigam; m'we nye ya oge.