Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 2:3-10 Bible Nso (IGBOB)

3. M'we si eze, Ka eze di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: gini mere irum agaghi-eji jọ njọ, mb͕e obodo ahu, bú ulo nke ílì nnam-hà, bu nkpọnkpọ ebe, eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile n'ọku?

4. Eze we sim, Ọ̀ bu gini kwa ka gi onwe-gi nāchọ? M'we kpere Chineke nke elu-igwe.

5. M'we si eze, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na orù-gi di nma n'anya-gi, ọ bu ka i zigam na Juda, rue obodo ílì nnam-hà, ka m'we wue ya.

6. Eze we sim, (nwunye eze nānọdu kwa n'akuku ya,) Rùe ole mb͕e ka ije-gi gādi? òle mb͕e ka i gālaghachi kwa? O we di nma n'anya eze, o we zigam; m'we nye ya oge.

7. M'we si eze, Ọ buru na ọ di eze nma, ka enyem akwukwọ-ozi inye ndi nāchi ala n'ofè osimiri, ka ha kwe ka m'gabiga rue mb͕e m'batara Juda;

8. na akwukwọ-ozi inye Esaf, bú onye nēche ogige ọma nke eze nwere, ka ọ nyem osisi ijikọta ọnu-uzọ-ama nile nke ulo uku ahu n'otù nke diri ulo ahu, na ijikọta mb͕idi obodo n'otù, na ijikọta ulo n'otù, bú nke m'gābà nime ya. Eze we nyem, dika ezi aka Chinekem si di n'arum.

9. M'we biakute ndi nāchi ala n'ofè osimiri, m'we nye ha akwukwọ-ozi eze. Ma eze zìri ndi-isi usu-ndi-agha na ndi-inyinya isom je.

10. Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, we nu ya, o we di ha njọ nke-uku na madu abiawo ichọrọ umu Israel ọdi-nma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nehemaia 2