Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 9:14-22 Bible Nso (IGBOB)

14. Osisi nile we si ogwu, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi.

15. Ogwu we si osisi nile, Ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu ka unu onwe-unu nētem manu iburu unu eze, bianu, b͕abànu n'okpuru ndo nkem: ma ọ buru na ọ bughi n'ezi-okwu, ka ọku si n'ogwu puta, ripia osisi cedar nile nke Lebanon.

16. Ma ub͕u a, ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu na n'izu-okè ka unu meworo ihe a, na unu emewo Abimelek eze, ọ buru kwa na ọ bu ezi ihe ka unu meworo Jerubeal, me kwa ulo-ya, ọ buru kwa na ọ bu dika nmeso aka-ya abua si di ka unu meworo ya;

17. (n'ihi na nnam būru agha bayere unu, tufue ndu-ya n'iru ya, we naputa unu n'aka Midian:

18. ma unu onwe-unu ebiliwo imegide ulo nnam ta, b͕u kwa umu-ya ndikom, bú ọgu ndikom atọ na iri, n'elu otù nkume, me kwa Abimelek, bú nwa orù-ya nwayi, eze ndi-nwe Shekem, n'ihi na nwa-nne-unu ka ọ bu;)

19. ma ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu na n'izu-okè ka unu meworo Jerubeal, me kwa ulo-ya, ta, ṅurianu ọṅu n'Abimelek, ka ọ ṅuria kwa nime unu, ọbuná ya onwe-ya:

20. ma ọ buru na ọ bughi otú a, ka ọku si n'Abimelek puta, ripia ndi-nwe Shekem, na ulo Milo; ka ọku si kwa na ndi-nwe Shekem puta, si kwa n'ulo Milo puta, ripia Abimelek.

21. Jotam we b͕alaga, b͕apu, jerue Bia, biri n'ebe ahu, n'ihi Abimelek, bú nwa-nne-ya.

22. Abimelek we buru onye-isi Israel arọ atọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 9