Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 7:3-14 Bible Nso (IGBOB)

3. Ma ub͕u a, biko, kpọ òkù na nti ndi nka, si, Ònye nātu egwu, nāma kwa jijiji? ya laghachi, si n'ugwu Gilead b͕alaga. Orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise we si na ndi Israel laghachi; ma orú nnù ndikom na nnù ise fọduru.

4. Jehova we si Gideon, Ndi Israel bara uba rue ub͕u a; me ka ha ridarue miri ahu, M'gānwaputa-kwa-ra gi ha n'ebe ahu: ọ gēru kwa, na onye ọ bula M'gāsi gi, Onye a gēsoro gi je, ọ bu onye ahu gēsoro gi je; ma onye ọ bula M'gāsi gi, Onye a agaghi-eso gi je, ọ bu onye ahu nāgaghi-eje.

5. O we me ka ndi Israel ridarue miri ahu: Jehova we si Gideon, Onye ọ bula nke ji ire-ya ra miri, dika nkita nāra, onye ahu ka i gēdo n'onwe-ya iche; onye ọ bula kwa nke nēruru n'ikperè-ya abua iṅu miri.

6. Ọnu-ọgugu ndi nāra miri, n'itiye aka-ha n'ọnu-ha, di ọgu ndikom iri-na-ise: ma ndi nile fọduru nime ndi Israel ruru n'ikperè-ha iṅu miri.

7. Jehova we si Gideon, Ọ bu ọgu ndikom iri-na-ise ahu ndi nāra miri ka M'gēji zọputa unu, nye kwa Midian n'aka-gi; ma ka ndi Israel nile la, onye ọ bula n'ebe nke ya.

8. Ndi ahu we were ihe-oriri-uzọ n'aka-ha, na opì-ike-ha: ma o zilagara ndikom nile nke Israel, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya, ma ọgu ndikom iri-na-ise ahu ka o jidere: ma ọmuma-ulo-ikwū Midian di n'okpuru ya nime ndagwurugwu ahu.

9. O rue, n'abali ahu, na Jehova siri ya, Bilie, rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na enyewom ya n'aka-gi.

10. Ma ọ buru na gi onwe-gi atua egwu irida, gi na Pura, bú nwa-okorọbia-gi, ridarue ọmuma-ulo-ikwū ahu:

11. i gānu kwa ihe ha nēkwu: emesia agēme kwa ka aka-gi abua di ike ka i we rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu. O we rida, ya onwe-ya na Pura, bú nwa-okorọbia-ya, rue nsọtu ndi chiri ihe-ekike-agha, ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū ahu.

12. Ma ndi Midian na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu nile nāmade nime ndagwurugwu ahu dika igurube n'uba; iguta-ọgugu adighi kwa camel-ha, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba.

13. Gideon we bia, ma, le, otù nwoke nēzere ibe-ya nrọ, si, Le, arọrọm nrọ, ma, le, buruburu achicha ọka barley nākpọre ba n'ọmuma-ulo-ikwū Midian, ọ biarue ulo-ikwū, tie ya, o we da, achicha ahu we me ka o kpue iru, ulo-ikwū ahu we tọb͕ọ n'ala.

14. Ibe-ya we za, si, Nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi mma-agha Gideon nwa Joash, bú nwoke Israel: Chineke enyewo Midian na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile n'aka-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 7