Ibe-ya we za, si, Nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi mma-agha Gideon nwa Joash, bú nwoke Israel: Chineke enyewo Midian na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile n'aka-ya.