Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 7:16-25 Bible Nso (IGBOB)

16. O we kewa ọgu ndikom iri-na-ise ahu n'usu atọ, o tiye n'aka-ha nile opì-ike, na ite nke ihe nādighi nime ha, na ọwa n'etiti ite ahu.

17. Ọ si ha, Lenum anya, me-kwa-unu otú a: ma, le, mb͕e mu onwem nābà na nsọtu ọmuma-ulo-ikwū-ha, ọ gēru kwa na, dika m'nēme, otú a ka unu gēme.

18. Mb͕e m'fùru opì-ike, mu onwem na ndi nile nke sorom, unu gāfù kwa opì-ike, ọbuná unu onwe-unu, buruburu ọmuma-ulo-ikwū ahu nile, si, Ayi diri Jehova, di-kwa-ra Gideon.

19. Gideon, na ọgu ndikom ise ndi soro ya, we ba na nsọtu ọmuma-ulo-ikwū na nmalite nche etiti abali, (ọ bu nání mb͕e ahu ka ha guzoro ndi-nche): ha we fùa opì-ike-ha, tupia kwa ite nke di n'aka-ha.

20. Usu atọ ahu we fùa opì-ike-ha, tiwa kwa ite-ha, jide kwa ọwa-ha n'aka-ekpe-ha, na opì-ike-ha n'aka-nri-ha, ifù afù: ha we tie nkpu, si, Mma-agha diri Jehova di-kwa-ra Gideon.

21. Ha we guzo, nwoke ọ bula n'ọnọdu-ya, buruburu ọmuma-ulo-ikwū ahu: ọmuma-ulo-ikwū ahu nile we b͕a ọsọ; ha we tie nkpu, b͕alaga.

22. Ha we fùa ọgu opì-ike iri-na-ise ahu, Jehova we me ka mma-agha nwoke ọ bula di n'aru ibe-ya, na n'aru ọmuma-ulo-ikwū ahu nile: ọmuma-ulo-ikwū ahu we b͕alaga rue Bet-shita n'uzọ Zerera, rue uzọ Ebel-mehola, n'akuku Tabat.

23. Ndikom Israel we si Naftali, na n'Asha, na nime Manase nile, kpọkọta onwe-ha, chua Midian n'azu.

24. Gideon we ziga ndi-ozi n'ugwu Efraim nile, si, Ridatanu izute Midian, burunu ha uzọ were miri, rue Bet-bara, bú Jọdan. Ndikom nile nke Efraim we kpọkọta onwe-ha, were miri ahu rue Bet-bara, bú Jọdan.

25. Ha we nwude ndi-isi abua nke Midian, bú Oreb na Zeeb; ha we b͕ue Oreb n'oke nkume Oreb, b͕u kwa Zeeb n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke Zeeb, we chua Midian: ha we wetara Gideon isi Oreb na Zeeb n'ofè Jọdan.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 7