Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 5:15-21 Bible Nso (IGBOB)

15. Ndi-isi n'Isaka nọye-kwa-ra Debora;Dika Isaka si di, otú a ka Berak di;Na ndagwurugwu ka ezigara ya n'ukwu-ya abua.Na miri-iyi nile nke ReubenKa oké nzube obi di.

16. N'ìhi gini ka i nọduru n'etiti ogige-aturu-gi,Inu ob͕ub͕u-ọ̀jà anēb͕uru ìgwè aturu?Na miri-iyi nile nke ReubenKa oké nnyocha obi di.

17. Gilead biri n'ofè Jọdan:Dan kwa, n'ìhi gini ka ọ nọ n'ub͕o?Asha nọduru n'ọnu-miri oké osimiri,Ọ bu kwa n'akuku ọwara-miri-ya nile ka o nēbi.

18. Zebulun bu ndi nyebigara ndu-ha rue ọnwu,Naftali kwa, n'elu ebe nile di elu nke ọhia.

19. Ndi-eze biara, bū agha;Mb͕e ahu ndi-eze Kenean būru agha,Nime Teanak n'akuku miri Megido:Ọ dighi urù ego ha nara.

20. N'elu-igwe ka ha si bū agha,Kpakpando si n'uzọ nile ha atuliri atuli buso Sisera agha.

21. Miri-iyi Kaishon bupuru ha,Miri-iyi ochie ahu, bú miri-iyi Kaishon.Nkpuru-obim, i nāzọda ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 5