Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 20:41-48 Bible Nso (IGBOB)

41. Ndikom Israel we chigharia, ndikom Benjamin we ma jijiji: n'ihi na ha huru na ihe ọjọ emetuwo ha aru.

42. Ha we chigharia n'iru ndikom Israel rue uzọ ọzara; ma agha ahu sogidesiri ha ike; ndi siri n'obodo nile puta nēbibi ha n'etiti ha.

43. Ha we b͕a Benjamin buruburu, chua ha, zọkwasi ha ukwu n'ebe-izu-ike-ha, rue na ncherita-iru Gibea n'akuku ọwuwa-anyanwu.

44. Orú nnù ndikom uzò abua na nnù ise nke Benjamin we da; ndia nile bu ndi-dìnkpà.

45. Ha we chigharia b͕alaga n'uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon: ha we ghọrọ ha, bú nnù ndikom iri-na-abua na ọgu iri, n'uzọ atuliri atuli, we sogidesi ha ike rue Gidom, tib͕ue nime ha nnù ndikom ise.

46. Ndi nile ndi si na Benjamin da n'ubọchi ahu di orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ndi nāmiputa mma-agha; ndia nile bu ndi-dìnkpà.

47. Ma nnù ndikom na ọgu iri chighariri b͕alaga n'uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon, nọdu na nkume di elu, bú Rimon, ọnwa anọ.

48. Ndikom Israel we laghachikuru umu Benjamin, were ọnu mma-agha tib͕ue ha, site n'obodo ndikom rue anu-ulo na ihe ọ bula nke achọtara achọta; ọzọ kwa, obodo nile nke ha chọtara, ha suru ha ọku.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 20