Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 20:17-33 Bible Nso (IGBOB)

17. Ma ndikom Israel gukọtara onwe-ha, orú ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi Benjamin: ndia nile bu ndikom agha.

18. Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ.

19. Umu Israel we bilie n'ututu, ma ulo-ikwū-ha megide Gibea.

20. Ndikom Israel we pua ibuso Benjamin agha; ndikom Israel we do agha n'usoro megide ha na Gibea.

21. Umu Benjamin we si na Gibea puta, bibi rue ala n'etiti Israel n'ubọchi ahu orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise.

22. Ndi ahu, bú ndikom Israel, we me onwe-ha ka ha di ike, ha we do kwa agha n'usoro ọzọ n'ebe ha doro onwe-ha n'usoro n'ubọchi mbu.

23. (Umu Israel we rigo, kwa ákwá n'iru Jehova rue anyasi; ha we jua Jehova ase, si, M'gābiaru kwa nso ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha? Jehova we si, Rigonu megide ya.)

24. Umu Israel we biarue nso imegide umu Benjamin n'ubọchi nke-abua.

25. Benjamin we si na Gibea puta izute ha n'ubọchi nke-abua ahu, ha we bibie ọzọ rue ala n'etiti umu Israel orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise; ndia nile nāmiputa mma-agha.

26. Umu Israel nile, na ndi ahu nile, we rigo, biarue Bet-el, kwa ákwá, nọdu n'ebe ahu n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu rue anyasi; ha we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova.

27. Umu Israel we jua Jehova ase, (n'ihi na n'ebe ahu ka ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke di na mb͕e ahu,

28. Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, nēguzo kwa n'iru ya na mb͕e ahu,) si, M'gapu kwa ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha, ma-ọbu #m'gāgha? Jehova we si, Rigonu; n'ihi na echi ka M'gēnye ya n'aka-gi.

29. Israel we do ndi nēru nbì megide Gibea buruburu.

30. Umu Israel we rigo megide umu Benjamin n'ubọchi nke-atọ, do onwe-ha n'usoro megide Gibea, dika ha mere ub͕ò abua gara aga.

31. Umu Benjamin we pua izute ndi Israel, ewe dọpu ha n'obodo; ha we malite itib͕u ufọdu n'etiti ndi Israel na ib͕u ha, dika ha mere ub͕ò abua gara aga, n'uzo abua atuliri atuli, nke otù nime ha nārigo Bet-el, otù nārigo kwa Gibea, n'ọhia, ihe ra ka orú ndikom na iri nime Israel.

32. Umu Benjamin we si, Anētib͕u ha n'iru ayi, dika na mbu. Ma umu Israel siri, Ka ayi b͕alaga, si n'obodo dọputa ha n'uzọ atuliri atuli.

33. Ndikom nile nke Israel we si n'ọnọdu-ha bilie, do onwe-ha n'usoro na Beal-tema: ndi Israel ndi nēru nbì nāwaputa kwa n'ọnọdu-ha, na Maare-geba.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 20