Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 19:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, na mb͕e ahu, mb͕e eze nādighi n'Israel, na otù nwoke, bú onye Livai, di nānọ dika ọbìa n'akuku azu ugwu Efraim, o we si na Bet-lehem-juda kuru n'onwe-ya nwayi bu iko.

2. Iko-ya nwayi ahu we kwa iko megide ya, si n'ebe ọ nọ la n'ulo nna-ya rue Bet-lehem-juda, nọ n'ebe ahu ubọchi ruru ọnwa anọ.

3. Nwoke-ya we bilie, jeso ya, igwa ya okwu gābà ya n'obi, ime ka ọ lata, nwa-okorọbia-ya na inyinya-ibu abua soro kwa ya je: nwayi ahu we me ka ọ ba n'ulo nna-ya: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we hu ya, ṅuria izute ya.

4. Ọgọ-ya nwoke, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, we jide ya; o we nọ n'ulo-ya ubọchi atọ: ha we rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.

5. O rue, n'ubọchi nke-anọ, na ha biliri n'isi-ututu, o we bilie ila: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si ọgọ-ya, Were iberibe achicha nwe ume n'obi-gi, ma emesia unu gāla.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 19