Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 15:16-20 Bible Nso (IGBOB)

16. Samson we si,Ọkpukpu - àb͕à inyinya - ibu ka m'jiworo, otù obo, obo abua,Ọkpukpu - àb͕à inyinya - ibu ka m'jiworo tib͕u nnù ndikom abua na ọgu iri.

17. O rue, mb͕e o kwubìri okwu, na ọ tupuru ọkpukpu-àb͕à-anu ahu n'aka-ya; o we kpọ ebe ahu Remat-lehi.

18. Akpiri we kpọ ya nku nke-uku, o we kpọkue Jehova, si, Gi onwe-gi esiwo n'aka orù-gi nye nzọputa uku a: ma ub͕u a m'gānwu n'akpiri-ikpọ-nku, dabà n'aka nke ndia anēbìghi úgwù.

19. Chineke we b͕awa olùlù ahu nke di nime Lehi, miri we si nime ya puta; o we ṅua, mọ-ya we biaghachi, o we di ndu; n'ihi ya ọ kpọrọ aha-ya En-hakore, nke di na Lehi, rue ta.

20. Ọ we kpe Israel ikpe na mb͕e ndi Filistia orú arọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 15