Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 14:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Samson we ridarue Timna, hu otù nwayi nime Timna sitere n'umu-ndinyom ndi Filistia.

2. O we rigota, gosi nna-ya, gosi kwa nne-ya, si, Ahuwom otù nwayi nime Timna sitere n'umu-ndinyom ndi Filistia: ma ub͕u a, lutaram ya na nwunye.

3. Nna-ya na nne-ya we si ya, Ọ̀ dighi nwayi di n'etiti umu-ndinyom umu-nne-gi, ma-ọbu n'etiti ndim nile, na gi onwe-gi nēje iluru nwunye sitere na ndi Filistia, bú ndi anēbìghi úgwù? Samson we si nna-ya, Lutaram ya; n'ihi na ya onwe-ya ziri ezi n'anyam.

4. Ma nna-ya na nne-ya amaghi na ọ bu Jehova ka o sitere n'aka; n'ihi na uzọ Ọ gēsi megide ndi Filistia ka ya onwe-ya nāchọ. Ma na mb͕e ahu ndi Filistia nāchi Israel.

5. Samson we rida, ya na nna-ya na nne-ya, rue Timna, ha we biarue ubi-vine Timna: ma, le, nwa-ọdum tozuru etozu nāb͕ọ uja izute ya.

6. Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we dọwa ya dika ọ gādọwa nwa-ewu, ma ọ dighi ihe o ji n'aka-ya: ma o gosighi nna-ya, o gosighi kwa nne-ya, ihe o mere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 14