Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 1:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e ọnwu Joshua gasiri, na umu Israel juru Jehova ase, si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi imegide ndi Kenean, ibuso ha agha?

2. Jehova we si, Juda gārigo: le, enyewom ala nka n'aka-ya.

3. Juda we si Simeon, bú nwa-nne-ya, Sorom rigo n'ala-ife-nzàm, ka ayi we buso ndi Kenean agha; mu onwem gēsoro kwa gi je n'ala-ife-nzà-gi. Simeon we soro ya je.

4. Juda we rigo; Jehova we nye ndi Kenean na ndi-Perizait n'aka-ha: ha we tib͕ue ha nime Bezek, orú nnù ndikom na nnù ise.

5. Ha we hu Adoni-bezek nime Bezek: ha we buso ya agha, tib͕ue ndi Kenean na ndi-Perizait.

6. Ma Adoni-bezek b͕alagara; ha we chua ya n'azu, jide ya, bipu isi-aka-ya abua na isi-ukwu-ya abua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 1