Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 26:13-29 Bible Nso (IGBOB)

13. Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt, si kwa n'iburu ha ndi-orù, puta; M'tijiwo kwa nkpọrọ nile nke yoke-unu, me kwa ka unu je ije iguzo-ọtọ.

14. Ma ọ buru na unu egeghm nti, unu ewe ghara ime ihe nile ndia M'nyere n'iwu;

15. ọ buru kwa na unu aju ukpurum nile, ọ buru kwa na nkpuru-obi-unu asọ ikpém nile oyi, unu ewe ghara ime ihe nile M'nyere n'iwu, ka unu we mebie ọb͕ub͕a-ndum;

16. Mu onwem gēme kwa unu nka; M'gēme obi-ọlulọ-miri ka ọ buru onye-nlekọta-unu, bú ọtita-aru na aru-ọku, nēme ka anya-unu hubìe uzọ, nēme kwa ka nkpuru-obi-unu b͕azepu: unu gāgha kwa nkpuru-unu n'efu, ndi-iro-unu gēri kwa ya.

17. M'gēche irum imegide unu, agētib͕u kwa unu n'iru ndi-iro-unu: ndi nākpọ unu asì gāzọda unu; unu gāb͕alaga kwa mb͕e ọ nādighi onye nāchu unu.

18. Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti rue ihe ndia, M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa ọzọ n'ihi nmehie nile unu.

19. M'egetiji nweli-elu nke ike-unu; M'gēme kwa elu-igwe-unu ka ọ di ka ígwè, me kwa ala-unu ka ọ di ka ọla:

20. ike-unu gāgwu kwa n'efu: ala-unu agaghi-ami kwa ihe-ọmume-ya, osisi nke ala agaghi-ami kwa nkpuru-ha.

21. Ma ọ buru na unu ejeghari n'imegidem, we ghara ikwe igem nti; M'gātukwasi kwa unu ihe-otiti ub͕ò asa ọzọ dika nmehie-unu nile si di.

22. M'gēzite anu-ohia n'etiti unu, ha gēme kwa ka unu b͕a aka umu, ha gēb͕upu kwa anu-ulo-unu, me kwa ka unu di ole-na-ole, uzọ nile unu gātọb͕ọ kwa n'efu.

23. Ma ọ buru na adọghi unu aka na nti n'ebe M'nọ site n'ihe ndia, ma unu nējeghari n'imegidem;

24. Mu onwem gējeghari kwa n'imegide unu; M'gēti kwa unu ihe ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.

25. M'gēme kwa ka mma-agha biakwasi unu, nke nābọ̀ ọ́bọ̀ ọb͕ub͕a-ndum; agāchikọta kwa unu nime obodo nile unu: M'gēzite kwa ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu; agēnye kwa unu n'aka ndi-iro.

26. Mb͕e M'gākpajiri unu nkpa-n'aka-unu, bú achicha, ndinyom iri gēsi achicha-unu n'otù ite-ọku, ha gēweghachi kwa achicha-unu n'ọtùtù: unu gēri kwa, ma afọ agaghi-eju unu.

27. Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti n'ihe a, ma unu nējeghari n'imegidem;

28. M'gējeghari kwa n'imegide unu n'ọnuma; M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.

29. Unu gēri anu-aru umu-unu ndikom, anu-aru umu-unu ndinyom ka unu gēri kwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 26