Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 25:45-55 Bible Nso (IGBOB)

45. Ọzọ kwa, ufọdu nime umu ndi-nnọdu ndi nọ dika ọbìa n'ala-unu, ufọdu nime ha ka unu gāb͕ata, na ufọdu nime ab͕uru-ha ndi nọ n'ala-unu ndi ha muru n'ala-unu: ha gābu-kwa-ra unu ihe-onwunwe.

46. Unu gēme ha ka ha buru ihe-nketa umu-unu ndi gānochi unu gēnwe, inweta dika-onwunwe; rue mb͕e ebighi-ebi ufọdu nime ndi ahu ka unu gēme ka ha buru orú-unu: ma unu ewela nkpab͕u zọda umu-nne-unu, bú umu Israel, nāzọdarita onwe-unu n'otù n'otù.

47. Ọzọ, mb͕e aka ọbìa ma-ọbu onye-nnọdu n'ala-unu gēru inwe àkù, ma nwa-nne-gi adawo ob͕eye n'akuku-ya, were onwe-ya renye ọbìa ma-ọbu onye-nnọdu n'ala-gi, ma-ọbu were onwe-ya renye onye bayere nkpọrọgwu n'ab͕uru ọbìa:

48. mb͕e eresiri ya, nb͕aputa diri ya; otù onye nke sitere n'umu-nne-ya gāb͕aputa ya:

49. ma-ọbu nwa-nne nna-ya, ma-ọbu nwa nwa-nne nna-ya, gāb͕aputa ya; ma-ọbu onye-aru-ya site n'ab͕uru-ya gab͕aputa ya; ma ọ buru na aka-ya erue inwe àkù, ọ gāb͕aputa onwe-ya.

50. Ya na onye b͕aworo ya gāgu kwa site n'aro ọ were onwe-ya renye ya rue arọ jubile: ego orire-ya gādi kwa ka ọnu-ọgugu arọ; dika ubọchi nile nke onye egoro ọlu ka ọ gānọ n'aka-ya.

51. Ọ buru na ọtutu arọ fọduru, dika ha si di ka ọ gēsite n'ego orire-ya nyeghachi ihe-nb͕aputa-ya.

52. Ma ọ buru na ole-na-ole fọduru n'arọ rue arọ jubile, ọ gāgu-kwa-ra ya; dika arọ-ya nile si di ka ọ gēnyeghachi ihe-nb͕aputa-ya.

53. Dika onye egoro ọlu kwa-arọ ka ọ gānọ n'aka-ya, ọ gaghi-ewere nkpab͕u zọda ya n'anya-gi.

54. Ma ọ buru na ab͕aputaghi ya n'arọ ndia, ọ gābu kwa n'arọ jubile, ya onwe-ya, na umu-ya tiyere ya.

55. N'ihi na Mu ka umu Israel buru ndi-orù; ndi-orùm ka ha bu ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 25