Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 22:12-25 Bible Nso (IGBOB)

12. Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e onye ala ọzọ nwere ya na nwunye, nwayi ahu agaghi-eri ihe ọ bula nime àjà-nbuli nke ihe nsọ nile.

13. Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e ọ bu nwanyi di-ya nwuru, ma-ọbu nwanyi achupuru achupu, ma o nweghi nkpuru, o we laghachi n'ulo nna-ya, dika mb͕e ọ di na nwata, ihe nime nri nna-ya ka o gēri: ma ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe ọ bula nime ya.

14. Ma mb͕e onye ọ bula gēri ihe nsọ n'amaghi-ama, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzo ise ya n'elu ya, nye onye-nchu-àjà ihe nsọ ahu.

15. Ha agaghi-eme kwa ka ihe nsọ nke umu Israel ghara idi nsọ, bú nke ha nēbuliri Jehova;

16. ha we ghara ime ka ha nēbu ajọ omume nke ikpe-ọmuma, mb͕e ha nēri ihe nsọ ha: n'ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ.

17. Jehova we gwa Moses okwu, si,

18. Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu, si ha, Nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa n'Israel, nke nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú nke diri nkwa-ha nile, ma-ọbu nke diri onyinye-afọ-ofufo-ha nile, nke ha nēweta nso Jehova ka ọ buru àjà-nsure-ọku;

19. unu gēweta nso oké nke zuru okè n'etiti ìgwè ehi, ma-ọbu n'etiti aturu, ma-ọbu n'etiti ewu, ka unu we buru ihe nātọ utọ.

20. Ihe ọ bula nke ọlu di n'aru ya, unu ewetala ya nso: n'ihi na ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ n'ọnọdu unu.

21. Ọzọ mb͕e onye ọ bula nēweta nso Jehova ihe àjà nke àjà-udo imezu nkwa, ma-ọbu inye onyinye-afọ-ofufo, n'etiti ìgwè ehi ma-ọbu n'etiti ìgwè ewu na aruru, ihe zuru okè ka ọ gābu ibu ihe nātọ utọ: ọlu ọ bula agaghi-adi n'aru ya.

22. Ihe kpuru ìsì, ma-ọbu ihe kpajiri akpaji, ma-ọbu ihe emeruru aru, ma-ọbu ihe nwere ọnyá, ma-ọbu ihe àb͕à nāta, ma-ọbu ihe nwere ire-ebube, unu ewetala ndia nso Jehova, unu esite-kwa-la na ha chuara Jehova àjà-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Ya.

23. Oke-ehi ma-ọbu nwa-aturu nke nwere n'aru-ya ihe ibe-ya nēnweghi, ma-ọbu nke kpọrọ ùkpọ̀, onyinye-afọ-ofufo ka i gēme ya; ma ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ bayere nkwa.

24. Ihe nke nkpuru-amu-ya chipiara echipia, ma-ọbu nke piara apia, ma-ọbu nke adọwapuru adọwapu, ma-ọbu nke ebipuru ebipu, unu ewetala ya nso Jehova: unu eme-kwa-la otú a n'ala-unu.

25. Unu esite-kwa-la n'aka onye ala ọzọ weta nso nri Chineke-unu site n'ihe ndia nile; n'ihi na nbibi-ha di nime ha, ọlu di n'aru ha: ha agaghi-abu ihe nātọ utọ n'ọnọdu unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 22