Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 20:5-16 Bible Nso (IGBOB)

5. Mu onwem gēdo kwa irum megide nwoke ahu, megide kwa ab͕uru-ya, Mu onwem gēbipu kwa ya ndi-nile nēso ya kwa iko, bú iso Molek kwa iko, n'etiti ndi-ha.

6. Madu ahu kwa nke nēche ndi nāju mọ ihe iru, nke nēche kwa ndi-dibia-afa iru, iso ha kwa iko, M'gēdo irum megido madu ahu, bipu ya n'etiti ndi-ya.

7. Unu gēdo kwa onwe-unu nsọ we di nsọ; n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

8. Unu gēdebe ukpurum nile, me ha: Mu onwem bu Jehova nēdo unu nsọ.

9. N'ihi na onye ọ bula nke nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua: nna-ya ma-ọbu nne-ya ka ọ kọchaworo; ọbara-ya gādikwasi ya.

10. Nwoke nke ya na nwunye nwoke ọzọ nākwa iko, bú onye ya na nwunye madu-ibe-ya nākwa iko, aghaghi ime ka ha nwua, bú nwoke ahu nākwa iko, na nwayi ahu nākwa iko.

11. Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nna-ya nēdina, ọtọ nna-ya ka o kpugheworo: aghaghi ime ka ha abua nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.

12. Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nwa-ya nēdina, aghaghi ime ka ha abua nwua: ngwakọta ọjọ ka ha meworo; ọbara-ha gādikwasi ha.

13. Nwoke ọ bula nke ya na nwoke nēdina, dika nwoke na nwayi nēdina, ihe-árú ka ha abua meworo: aghaghi ime ka ha nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.

14. Nwoke ọ bula nke nēkuru nwayi na nne-ya, nzube ọjọ ka ọ bu: n'ọku ka agēsure ha, ya na ha; ka nzube ọjọ we ghara idi n'etiti unu.

15. Nwoke ọ bula nke ya na anumanu nēdina ka ọ ra aru n'aru-ya, aghaghi ime ka ọ nwua: unu gēb͕u kwa anumanu ahu.

16. Nwayi ọ bula nke nābiaru nso anumanu ọ bula, iso ya dina, i gēb͕u nwayi ahu na anumanu ahu: aghaghi ime ka ha nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 20