Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 13:27-38 Bible Nso (IGBOB)

27. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n'ubọchi nke-asa: ọ buru na ọ ba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu.

28. Ma ọ buru na ntupọ nke nēke uke eguzo n'ọnọdu-ya ma ọ baghi aba n'akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi; ihe-otutó nke ọku-ọruru ahu ka ọ bu, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha: n'ihi na apa ọku-ọruru ahu ka ọ bu.

29. Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ihe-otiti di n'aru-ya, n'isi ma-ọbu n'afu-ọnu,

30. onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti ahu: ma, le ọ, buru na ọ di omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na aji nācha edo edo, nke di irighiri, di nime ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ọria isi ka ọ bu, ekpenta nke isi ma-ọbu nke afu-ọnu ka ọ bu.

31. Ma mb͕e onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti nke ọria-isi ahu, ma, le, ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, aji oji adighi kwa nime ya, onye-nchu-àjà gēmechibido kwa onye nwere ihe-otiti ọria-isi ahu nime ulo ubọchi asa:

32. onye-nchu-àjà gāhu kwa ihe-otiti ahu n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ọria-isi ahu abaghi aba, ọ buru kwa na aji nke nācha edo edo adighi nime ya, ọ buru kwa na ọria-isi ahu adighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya,

33. agākọpu kwa isi-ya, ma, ọ gaghi-akọpu ọria-isi ahu: onye-nchu-àjà gēmechibido kwa onye nwere ọria-isi ahu ubọchi asa ọzọ:

34. onye-nchu-àjà gāhu kwa ọria-isi ahu n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ọria-isi abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, di ọcha.

35. Ma ọ buru na ọria-isi-ya aba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya mb͕e emesiri ka ọ di ọcha;

36. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ọria-isi abawo aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà agaghi-achọ aji nācha edo edo ahu; onye ruru árú ka ọ bu.

37. Ma ọ buru na ọria-isi ahu eguzowo n'anya-ya, ọ buru kwa na aji oji epuputawo nime ya; emewo ka ọria-isi ahu la, ọcha ka ọ di: onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha.

38. Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ntupọ di iche iche nke nēke uke, bú ntupọ nēke uke nke di ọcha, di n'akpukpọ anu-aru-ha;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 13