Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 13:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

2. Madu, mb͕e ihe-otutó, ma-ọbu ọnyá, ma-ọbu ntupọ nke nēke uke, di n'akpukpọ nke anu-aru-ya, mb͕e ihe ahu gāghọ n'akpukpọ nke anu-aru-ya ihe-otiti ekpenta, agēme kwa ka ọ biakute Eron, bú onye-nchu-àjà, ma-ọbu biakute otù nime umu-ya ndikom, bú ndi-nchu-àjà:

3. onye-nchu-àjà gāhu kwa ihe-otiti ahu di n'akpukpọ nke anu-aru-ya: ma ọ buru na aji nke di n'ihe-otiti ahu ab͕anwewo ọchā, ọ buru kwa na, n'ile ihe-otiti ahu anya, ọ di omimi kari akpukpọ anu-aru-ya, ihe-otiti ekpenta ka ọ bu: onye-nchu-aja gāhu kwa ya, si na ọ ruru árú.

4. Ma ọ buru na ntupọ ahu nke nēke uke di ọcha n'akpukpọ anu-aru-ya, ọ buru kwa na ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na aji-ya abanweghi ọcha, onye-nchu-àjà gēme-chibido onye nwere ihe-otiti ahu nime ulo abali asa:

5. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya anya n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu eguzo n'anya-ya, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa ọzọ:

6. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n'ubọchi nke-asa ọzọ: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha; ọnyá efu ka ọ bu; ọ gāsu kwa uwe-ya, di ọcha.

7. Ma ọ buru na ọnya ahu aba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, mb͕e emesiri ka onye-nchu-àjà hu ya ime ka ọ di ọcha, ọ gēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya nke ub͕ò abua:

8. onye-nchu-àjà gāhu kwa ya, ma, le, ọ buru na ọnyá ahu abawo aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ ruru árú: ekpenta ka ọ bu.

9. Mb͕e ihe-otiti ekpenta di n'aru madu, agēme kwa ka ọ biakute onye-nchu-àjà;

10. onye-nchu-àjà gāhu kwa, ma, le, ọ buru na ihe-otutó ọcha di n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ihe ahu emewo aji ka ọ b͕anwe ọcha, onyá nke anu-aru ndu adi kwa n'ihe-otutó ahu,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 13