Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 12:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Gwa umu Israel okwu, si, Nwayi, mb͕e ọ gātu ime, mua nwa-nwoke, ọ gāru kwa árú ubọchi asa; dika ubọchi idi-na-nsọ nke isọ-uba-ya si di, otú a ka ọ gāru árú.

3. N'ubọchi nke-asatọ agēbì ya úgwù n'anu-aru nke api-ya.

4. Orú ubọchi na iri na atọ ka nwayi ahu gānọgide n'ọbara nke ime ya ka ọ di ọcha; ọ dighi ihe nsọ ọ bula ọ gēmetu aka, ọ gaghi-abà kwa n'ebe nsọ ahu, rue ozùzù ubọchi nile nke ime ya ka ọ di ọcha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 12