Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 1:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we kpọ Moses òkù, si n'ulo-ikwū nzute gwa ya okwu, si,

2. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e madu ọ bula n'etiti unu gēweta nso Jehova onyinye iji biaru nso, unu gēsi n'etiti anu-ulo, n'etiti ìgwè ehi na n'etiti ìgwè ewu na aturu weta nso onyinye-unu ijì biaru nso.

3. Ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu àjà-nsure-ọku sitere n'ìgwè ehi, oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso: n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ka ọ gēweta ya nso, ka o we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova

4. O gēbikwasi aka-ya n'isi àjà-nsure-ọku ahu; agānara kwa ya nke-ọma n'ọnọdu ya iji kpuchiri ya nmehie-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 1