Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 7:18-26 Bible Nso (IGBOB)

18. o we me ka ulo-ya biarue nso na ndikom-ya; ewe nwude Ekan, nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda.

19. Joshua we si Ekan, Nwam, biko, nye Jehova, bú Chineke Israel, nsọpuru, nye kwa Ya ekele; biko, gosikwam ihe i meworo; ezopula ya n'ebe m'nọ.

20. Ekan we za Joshua, si, N'ezi-okwu mu onwem emehiewo megide Jehova, bú Chineke Israel, otú a na otú a ka m'mewo-kwa-ra:

21. m'we hu n'etiti ihe-nkwata otù ezi uwe-nwuda nke Shaina, na ọgu shekel ọla-ọcha iri, na otù nkpirikpi ọla-edo nke ọtùtù-ya di ọgu shekel abua na iri, m'we nwe anya-uku n'ebe ha di, m'we chiri ha; ma, le, ezoworo ha n'ala n'etiti ulo-ikwūm, ọla-ọcha ahu di kwa n'okpuru ya.

22. Joshua we ziga ndi-ozi, ha we b͕arue ulo-ikwū-ya; ma, le, ezoro ya n'ulo-ikwū-ya, ọla-ọcha ahu di kwa n'okpuru ya.

23. Ha we si n'ulo-ikwū ahu chiri ha, chitara ha Joshua, chita-kwa-ra ha umu Israel nile; ha we wusa ha n'iru Jehova.

24. Joshua, ya na Israel nile, we were Ekan nwa Zera, na ọla-ọcha ahu, na uwe-nwuda ahu, na nkpirikpi ọla-edo ahu, na umu-ya ndikom, na umu-ya ndinyom, na ehi-ya, na inyinya-ibu-ya, na ìgwè ewu na aturu-ya, na ulo-ikwū-ya, na ihe nile o nwere: ha we me ka ha rigorue Ndagwurugwu Ekoa.

25. Joshua we si, Gini mere i mekpaworo ayi aru? Jehova gēmekpa gi aru ta. Israel nile we were nkume ub͕ue ya; ha we sure ha n'ọku, were kwa nkume tub͕ue ha.

26. Ha we guzo n'elu ya oké obo nkume, rue ta; Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia. N'ihi ya akpọrọ aha ebe ahu, Ndagwurugwu Ekoa, rue ta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 7