Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 20:6-9 Bible Nso (IGBOB)

6. O gēbi kwa n'obodo ahu, rue mb͕e o gēguzo n'iru nzukọ Israel ka ekpe ya ikpe, rue ọnwu onye-isi-nchu-àjà nke gānọ na mb͕e ahu: mb͕e ahu ob͕u-madu ahu gālaghachi, ba n'obodo-ya, ba kwa n'ulo-ya, rue obodo ahu nke o si n'ebe ahu b͕alaga.

7. Ha we do obodo ndia nsọ, bú Kedesh nime Galili, n'ugwu Naftali, na Shekem n'ugwu Efraim, na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron) n'ugwu Juda.

8. N'ofè Jọdan n'akuku Jeriko n'akuku ọwuwa-anyanwu ha nye-kwa-ra Beza n'ọzara n'ala di lari site n'ebo Reuben, na Remot nime Gilead site n'ebo Gad, na Golan nime Beshan site n'ebo Manase.

9. Ndia bu obodo akara àkà bayere umu Israel nile, baye-kwa-ra ọbìa nke nānọ dika ọbìa n'etiti ha, ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu, ghara kwa onwu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, rue mb͕e ọ gēguzo n'iru nzukọ Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 20