Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 20:5-8 Bible Nso (IGBOB)

5. Ma mb͕e onye-ọ́bọ̀ ọbara gāchu ya n'azu, ha agaghi ekwe ka ob͕u-madu ahu ba n'aka-ya; n'ihi na ọ bu n'amaghi-ama ka o tib͕uru madu-ibe-ya, ma ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga.

6. O gēbi kwa n'obodo ahu, rue mb͕e o gēguzo n'iru nzukọ Israel ka ekpe ya ikpe, rue ọnwu onye-isi-nchu-àjà nke gānọ na mb͕e ahu: mb͕e ahu ob͕u-madu ahu gālaghachi, ba n'obodo-ya, ba kwa n'ulo-ya, rue obodo ahu nke o si n'ebe ahu b͕alaga.

7. Ha we do obodo ndia nsọ, bú Kedesh nime Galili, n'ugwu Naftali, na Shekem n'ugwu Efraim, na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron) n'ugwu Juda.

8. N'ofè Jọdan n'akuku Jeriko n'akuku ọwuwa-anyanwu ha nye-kwa-ra Beza n'ọzara n'ala di lari site n'ebo Reuben, na Remot nime Gilead site n'ebo Gad, na Golan nime Beshan site n'ebo Manase.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 20