Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 18:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha na Shailo, ma ulo-ikwū nzute n'ebe ahu: ewe buda ala ahu n'iru ha.

2. Ebo asa we fọdu n'etiti umu Israel, ndi anēkeghi ihe-nketa-ha.

3. Joshua we si umu Israel, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu gābu ndi-ume-ngwu ibà inweta ala ahu, nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nyeworo unu?

4. Doronu onwe-unu ndikom atọ inọrọ ebo ọ bula: m'gēziga kwa ha, ha gēbili kwa, jegharia n'ala nka, de ya n'akwukwọ dika ihe-nketa-ha si di; ha gābiakutekwam.

5. Ha gēkè kwa ya òkè asa: Juda gēguzo n'ókè-ala-ya na Ndida, ulo Josef gēguzo kwa n'ókè-ala-ha n'Ugwu.

6. Unu onwe-unu gēde kwa ala ahu n'akwukwọ n'òkè asa, wetaram akwukwọ ahu n'ebe a: m'gēfe-kwa-ra unu nzà n'ebe a n'iru Jehova, bú Chineke-ayi.

7. N'ihi na ndi Livai enweghi òkè n'etiti unu; n'ihi na ọlu-nchu-àjà Jehova bu ihe-nketa-ha: Gad na Reuben na nkera ebo Manase anarawo kwa ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, nke Moses, bú orù Jehova nyere ha.

8. Ndikom ahu we bilie, je: Joshua we nye ndi nēje ide ala ahu n'akwukwọ iwu, si, Jenu, jegharia n'ala nka, de ya n'akwukwọ, laghachikutem, m'gēfe-kwa-ra unu nzà n'ebe a n'iru Jehova, nime Shailo.

9. Ndikom ahu we je, gabiga n'ala ahu, de ya n'akwukwọ dika obodo nile si di n'òkè asa, ha we biakute Joshua rue ọmuma-ulo-ikwū nime Shailo.

10. Joshua we fere ha nzà nime Shailo n'iru Jehova: Joshua we kère umu Israel ala n'ebe ahu dika esi kè ha n'òkè n'òkè.

11. Ife-nzà nke ebo umu Benjamin we puta dika ab͕uru nile ha si di; ókè-ala nke ihe-ife-nzà-ha we puta n'etiti umu Juda na umu Josef.

12. Ókè-ala ha nwere n'akuku Ugwu we site na Jọdan; ókè-ala ahu we rigo rue akuku Jeriko n'Ugwu, rigo kwa n'ugwu n'akuku Ọdida-anyanwu; ọpupu-ya di kwa n'ọzara Bet-even.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 18