Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 15:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Ife-nzà nke mara ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di we dirue ókè-ala Edom, rue ọzara Zin n'akuku Ndida, na nsọtu Ndida.

2. Ókè-ala Ndida nke ha nwere we di site na nsọtu Oké Osimiri Nnú, site n'ọnu-miri nke nēche iru na Ndida:

3. o we pua rue akuku Ndida nke nrigo Akrabim, gabiga rue Zin, rigo n'akuku Ndida nke Kedesh-banea, gabiga Hezron, rigorue Ada, b͕a buruburu rue Kaka:

4. o we gabiga rue Azmon, pua na miri-iyi Ijipt; ọpupu ókè-ala ahu we di n'oké osimiri: nka gāburu unu ókè-ala Ndida.

5. Ókè-ala ọwuwa-anyanwu we buru Oké Osimiri Nnú, rue nsọtu Jọdan. Ókè-ala akuku Ugwu we site n'ọnu-miri nke oké osimiri ahu na nsọtu Jọdan:

6. ókè-ala ahu we rigo rue Bet-họgla, gabiga n'akuku Ugwu nke Bet-araba; ókè-ala ahu we rigo rue nkume Bohan nwa Reuben:

7. ókè-ala ahu we rigo rue Debia site na ndagwurugwu Ekoa, ga n'akuku Ugwu, nēche Gilgal iru, nke di na ncherita-iru nrigo Adumim, nke di n'akuku Ndida nke miri-iyi ahu: ókè-ala ahu we gabiga rue miri En-shemesh, ọpupu-ya we dirue En-rogel:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 15