Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 34:21-29 Bible Nso (IGBOB)

21. N'ihi na anya-Ya dikwasi uzọ nile nke madu,Nzọ-ukwu-ya nile ka Ọ nāhu kwa.

22. Ọ dighi ọchichiri di, ọ dighi kwa onyinyo ọnwu di,Ebe ndi nālu ajọ ihe gēzo onwe-ha.

23. N'ihi na Ọ dighi-atukwasi madu ihe ọzọ,Ọ bu nání ijekuru Chineke n'ikpé.

24. O nētijisi ndi di ike, ma ngwuputa-ala-ya adighi,Ọ we neguzo ndi ọzọ n'ọnọdu ha.

25. N'ihi ya Ọ nāmata ọlu nile ha;O we nēkpù ha iru n'abali, ewe zọpia ha.

26. Dika ndi nēmebi iwu ka O tiworo ha akaN'ọnọdu ndi nāhu ha anya;

27. N'ihi na ha esiwo n'iso Ya wezuga onwe-ha,Ha eweghi kwa uche le uzọ-Ya nile anya:

28. Ime ka iti-nkpu nke onye nēnweghi ike biarue Ya ruo,Iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala ka Ọ nānu kwa.

29. Mb͕e Ya onwe-ya nēme ka anọ jū, ònye gāma kwa ikpe?Mb͕e O nēzobe iru-Ya, ònye gēkiri kwa Ya?Ma ọ bu n'ebe mba nọ, ma-ọbu n'ebe madu nọ, n'otù aka ahu:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 34