3. Madu emewo ọchichiri ka o nwe ọgwugwu,Rue nsọtu nile ka ya onwe-ya nēgwuputa kwaNkume nke oké ọchichiri na onyinyo ọnwu.
4. O siwo n'ebe madu nọ dika ọbìa tua ọnu;Ha bu ndi ukwu nke nāga aga nēchezọ;Anākwuba ha udọ̀ n'ebe di madu anya, ha nākwufeghari.
5. Ala, nime ya ka nri si aputa:Ma n'okpuru ya ka atughariworo ya dika ọ bu ọku mere ya.
6. Ọnọdu sapphire ka nkume-ya nile bu,Ọ nwe-kwa-ra ájá ọla-edo.
7. Ọ bu uzọ nke udele nāmaghi,Anya agu-nkwọ ahughi kwa ya:
8. Anu-ọhia di nganga azọghi ya ukwu,Ọdum nāb͕ọ uja agabigaghi kwa n'elu ya.
9. Oké nkume ọmu ka o setipuworo aka-ya imegide;Okpùwo ugwu iru site na nkpọrọgwu-ha.
10. N'oké nkume nile ka ọ waputaworo uzọ miri si erù;Anya-ya ahuwo kwa ihe ọ bula di oké ọnu-ahia.
11. O kechiwo osimiri ka ha ghara itu miri;Ihe-nzuzo ka ọ nēme kwa ka ọ puta ìhè.
12. Ma amam-ihe, òle ebe agāchọputa ya?Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?
13. Madu amaghi ọ̀rùrù-ọnu-ya;Agaghi-achọta kwa ya n'ala ndi di ndu.
14. Ob͕u-miri siri, Ọ bughi nimem ka ọ di:Oké osimiri si-kwa-ra, Ọ dighi n'akam.
15. Adighi-enye ọla-edo makarisiri nma n'ọnọdu ya,Adighi-atù kwa ọla-ọcha ibu ọnu-ahia-ya.