Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 24:7-24 Bible Nso (IGBOB)

7. Ha nānọ ọnọdu-abali b͕ara ọtọ nēnweghi uwe,Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ha nwere n'oyi.

8. Oké miri-ozuzo nke ugwu nēde ha,Ma ebe ha nēnweghi ebe-nb͕abà, ha we b͕akua oké nkume.

9. Ufọdu nānapu nwa-nb͕ei n'ara n'ike,Nara kwa onye ewedara n'ala ihe-ibe:

10. Ha we nējeghari b͕ara ọtọ nēnweghi uwe,N'agu-ha ka ha nēbu kwa ùkwù-ọka;

11. N'etiti mb͕idi-ha ka ha nāpi manu;Ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile ha ka ha nāzọ ukwu, ma akpiri nākpọ ha nku.

12. Ha nēsi n'obodo ndikom sua udè,Nkpuru-obi ndi emeruworo aru nētiku Chineke:Ma Chineke adighi-agu ya n'ihe-nzuzu.

13. Ndi ahu nọ n'etiti ndi nānupu isi n'okpuru ìhè;Ha amataghi uzọ-ya nile,Ha ebighi kwa n'okporo-uzọ-ya nile.

14. Ìhè ututu ka ob͕u-madu ji bilie, o nēb͕u onye ewedara n'ala na ob͕eye;N'abali kwa ọ di ka onye-ori.

15. Ọzọ, anya onye nākwa iko nāriba chi-ojiji ama,Si, Ọ dighi anya ọ bula gēkirim:Ọ nēzobe iru-ya.

16. O gwupúwo ulo n'ọchichiri:N'ehihie ha nēmechibido onwe-ha uzọ;Ha amaghi ìhè.

17. N'ihi na ututu buru usu ha nile onyinyo ọnwu;N'ihi na ọ nāmata ihe-egwu nile nke onyinyo ọnwu.

18. Onye di nfe n'elu miri ka ọ bu;Anākọcha òkè-ha n'uwa:Ọ dighi-eche uzọ ubi-vine iru.

19. Ikpọ-nku na okpom-ọku nānapu miri snow n'ike:Otú a ka ala-mọ nēme ndi mehieworo.

20. Àkpà-nwa gēchezọ ya, aru-ya gātọ ikpuru utọ n'oriri;Agaghi-echeta kwa ya ọzọ:Agānyaji kwa ajọ omume dika osisi.

21. Ọ nēmeb͕u nwayi-àgà nke nādighi-amu nwa;Ọ dighi-eme kwa nwayi di-ya nwuru nma.

22. Ma O mewo ka ndi di ike nke-uku nādigide ndu site n'ike-Ya:O nēbili, ma ọ dighi onye kwere na ọ gādi ndu.

23. Chineke nēme ka ọ nọ na ntukwasi-obi, ọ nādabere kwa na ya;Ma anya-Ya dikwasi n'uzọ nile ha.

24. Ha di elu; na nwa mb͕e ha anọghi;Akwadawo kwa ha, chikọba ha dika madu nile,Ewe bipu ha dika ọnu-ọnu oko ọka.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 24