5. Ọzọ, agēmenyu ìhè nke ndi nēmebi iwu,Ọ dighi kwa ire-ọku nke ọku-ya gēnwu.
6. Ìhè aghọwo ọchichiri n'ulo-ikwū-ya,Agēmenyu kwa oriọna-ya n'elu ya.
7. Agākpagide nzọ-ukwu nile nke ume-ya,Ndum-ọdu-ya gātuda kwa ya.
8. N'ihi na eji ukwu-ya abua ziga ya n'ub͕u eji eb͕u anu,Ọ nējeghari kwa n'elu ihe-ntuhi.
9. Ib͕udu gādakwasi ya n'ikiri-ukwu,Ọnyà gāma ya.
10. Ezobeworo ya udọ̀ n'ala,Na ihe iji nwude ya n'elu uzọ.
11. Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu,Ha we chugharia ya n'ukwu-ya.
12. Agu ganāgu ume-ya,Edoziwo kwa nhuju-anya n'akuku-ya.
13. Ọ gēripia ihe di n'akpukpọ-aru-ya,Ọkpara ọnwu gēripia ihe nile di ya n'aru.
14. Agādọpusi ya ike n'ulo-ikwū-ya, bú ihe-ntukwasi-obi-ya;Agēme ka ọ zọrọ ukwu gakuru eze nke ihe-egwu nile.
15. Ihe nābughi nke ya gēbi n'ulo-ikwū-ya:Agēfesa brimstone n'elu ebe-obibi-ya.
16. Nkpọrọgwu-ya gākpọ nku n'okpuru,Agēbipu kwa alaka-ya n'elu.
17. Ncheta-ya alawo n'iyì pua n'uwa,Ọ dighi kwa aha ọ gēnwe n'èzí.
18. Agākwapu ya n'ihè ba n'ọchichiri,Agēme kwa ka o si n'elu-uwa dum madu bi waghari.
19. Ọ dighi umu, ọ dighi kwa umu umu, ọ gēnwe n'etiti ndi-ya,Ọ dighi kwa onye fọduru n'ọnọdu-ọbìa-ya nile.
20. Ibobo bayere ubọchi-ya anwuwo ndi bi n'akuku Ọdida-anyanwu n'aru,Ndi bi n'akuku Iru-anyanwu atuwo kwa oké ujọ.