Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 52:13-20 Bible Nso (IGBOB)

13. o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku.

14. Usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea, ndi soro onye-isi ndi-ob͕ū, kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem buruburu.

15. Ma ufọdu nime ndi Israel nēnweghi ike, na ndi Israel fọduru, bú ndi fọduru n'obodo, na ndi gbapuru agbapu, bú ndi gbapuru jekuru eze Babilon, na ndi fọduru n'etiti ìgwè madu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri n'ala ọzọ.

16. Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka Nebuzaradan, onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlu-ubi.

17. Ma ogidi ọla nile nke di n'ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n'ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha nile je Babilon.

18. Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru.

19. Ọkwa nile kwa, na ihe-igu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ite nile, na ihe-idọba-oriọna nile, na ngaji nile, na iko nile; ihe nke bu ọla-edo, n'ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n'ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha.

20. Ogidi abua ahu, na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua nke ọla nke di n'okpuru ihe-ndọkwasi-ya nile, nke eze, bú Solomon, mere nye ulo Jehova; ọ dighi ọtùtù atùru ọla ihe ndia nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 52