Ma ogidi abua ahu, cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di; ogho cubit iri na abua b͕a-kwa-ra ya buruburu; ib͕idi-ya di nkpisi-aka anọ: ọ di oghere n'ime-ya.