Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 50:31-41 Bible Nso (IGBOB)

31. Le, Mu nēmegide gi, gi onye-nganga, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta): n'ihi na ubọchi-gi abiawo, bú mb͕e M'gēleta gi.

32. Onye-nganga gāsu kwa ngọngọ, da, ma ọ dighi onye ganēme ka o bilie: M'gēsuye kwa ọku n'obodo ya nile, o gēripia kwa ebe nile di ya buruburu.

33. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ndi emeb͕uru emeb͕u ka umu Israel na umu Juda bu n'otù: ndi nile dọtaworo ha n'agha ejidesiwo ha ike; ha ajuwo izilaga ha.

34. Onye-nb͕aputa-ha di ike; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: Ọ gēkpezu ọnu-ha, ka O we me ka uwa doro aru ala, me kwa ka ndi bi na Babilon me nkpatu.

35. Mma-agha di n'aru ndi Kaldea, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na n'ebe ndi bi na Babilon nọ, na n'ebe ndi-isi-ya nọ, na n'ebe ndi-ya mara ihe nọ.

36. Mma-agha di n'ebe ndi-ekwukwu nọ, ha gāghọ ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha: mma-agha di n'ebe ndi-dike-ya nọ, ha gātu kwa ujọ.

37. Mma-agha di n'ebe inyinya-ya nile di, na n'ebe ub͕ọ-ala-ya di, na n'ebe ndi nile gwara ọgwa nọ, bú ndi nọ n'etiti ya, ha gāghọ kwa ndinyom: mma-agha di n'ebe àkù-ya nile di, agāluta kwa ha n'agha.

38. Ọkpukpọ-nku di n'ebe miri-ya nile di, ha gāta kwa ata: n'ihi na ala arusi di iche iche apiri api ka ọ bu, ha ji kwa ihe-egwu nile ha wi ara.

39. N'ihi nka ka anu-ọhia di iche iche nke bi n'ala kpọrọ nku gēbi n'ebe ahu, ha na anu-ọhia nke nēbe ebe, enyi-nnunu gēbi kwa n'ebe ahu: madu agaghi-ebi kwa nime ya ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; ọ gaghi-abu kwa ebe-obibi rue ọb͕ọ nile.

40. Dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); otú a ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.

41. Le, otù ndi nēsi n'Ugwu bia; ọzọ, mba uku na ọtutu ndi-eze ka agākpọte site na nsọtu nile nke uwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 50