Onye-nganga gāsu kwa ngọngọ, da, ma ọ dighi onye ganēme ka o bilie: M'gēsuye kwa ọku n'obodo ya nile, o gēripia kwa ebe nile di ya buruburu.