Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 48:10-17 Bible Nso (IGBOB)

10. Onye anābu ọnu ka onye nke ji aghughọ eje ozi Jehova bu, onye anābu ọnu ka onye nke nēb͕opu mma-agha-ya n'ọbara bu kwa.

11. Onye nānọ jū ka Moab bu site na mb͕e ọ di na nwata, ọzọ, manya-vine doro edo ka ọ bu, esighi kwa n'otù ihe b͕aye ya n'ihe ọzọ, o jeghi kwa n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ: n'ihi nka ka utọ-ya guzoworo nime ya, ísì-ya ab͕anweghi kwa.

12. N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēzigara ya ndi nērulata ite manya-vine, ha ewe rulata ya; ọ bu kwa ihe manya-vine ya nile ka ha gāb͕apu, ọ bu kwa ite nile ha ka ha gātupia.

13. Ihere Kemosh gēme kwa Moab, dika ihere Bet-el, bú ihe-ntukwasi-obi-ha, mere ulo Israel.

14. Ùnu si aṅa si, Ndi-dike ka ayi bu, na ndi bu dìnkpà ibu agha?

15. Emebiwo Moab, obodo-ya nile akwugowo kwa n'anwuru-ọku umu-okorọbia-ya arọputara arọputa aridawo kwa n'ob͕ub͕u, ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.

16. Nhuju-anya Moab di nso ibia, ihe ọjọ ya nēme kwa ngwa nke-uku.

17. Gosinu ya ebere unu nwere n'aru ya, unu ndi nile ndi nọ ya buruburu, na unu nile ndi mara aha-ya; sinu, Èsi aṅa b͕aji nkpa-n'aka di ike, bú ndele mara nma?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 48