Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 4:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ buru na i gālata, gi Israel, (ọ bu ihe si nọnu Jehova puta), Mu ka i gālaghachikute: ọ buru kwa na i gēwezuga ihe-árú-gi nile n'irum, i gaghi-awaghari;

2. i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n'ezi-okwu, na n'ikpé ziri ezi, na n'ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi.

3. N'ihi na otú a ka Jehova siri ndikom Juda, si kwa Jerusalem, Lucharanu onwe-unu ubi, unu agha-kwa-la nkpuru n'etiti ogwu.

4. Bìenu onwe-unu úgwù nye Jehova, bìenu onwe-unu úgwù n'obi, unu ndikom Juda na ndi bi na Jerusalem: ka ọnuma m we ghara ipu dika ọku, we re nke ọ nādighi onye nēmenyu, site n'ihe ọjọ nke omume nile unu.

5. Gosinu na Juda, me-kwa-nu ka anuru ya na Jerusalem; si-kwa-nu, Fùanu opì-ike n'ala nka: kpọzuenu nkpu, si, Chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba kwa n'obodo nile ewusiri ike.

6. Bulienu ọkọlọtọ n'uzọ Zaion: latanu n'ulo ọsọsọ, unu eguzola: n'ihi na ihe ọjọ ka Mu onwem nēme ka o si n'Ugwu bia, ya na ntipia uku.

7. Ọdum esiwo n'alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n'ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.

8. N'ihi nka kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tienu aka n'obi, kwasi kwa ákwá ike: n'ihi na iwe di ọku nke Jehova esighi n'aru ayi laghachi.

9. O gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na obi eze gāla n'iyì, ya na obi ndi-isi; ibobo gānwu kwa ndi-nchu-aja n'aru, ọ gāb͕agwoju kwa ndi-amuma anya.

10. M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n'ezie I rafuwo ndi nka na Jerusalem nke-uku, si, Udo gādiri unu, ma mma-agha emetuwo nkpuru-obi aru.

11. Na mb͕e ahu ka agāsi ndi nka, si kwa Jerusalem, Ifufe di ọku, nke sitere n'ebe di elu nke ọhia nādighi ya nke di n'ọzara, nēfe n'uzọ ada ndim, ọ bughi ifucha afucha, ọ bughi kwa ime ka adi ọcha;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 4