Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 32:9-23 Bible Nso (IGBOB)

9. M'we zuru ubi ahu n'aka Hanamel nwa nwa-nne nnam, bú nke di n'Anatot, m'we tùara ya ego-ya, bú shekel iri na asa nke ọla-ọcha.

10. M'we de aham n'akwukwọ ala ahu, ka ya akàrà, kpọ ndi-àmà, tùara ya ego ahu n'ihe-ọtùtù.

11. M'we were akwukwọ nzuta-ala ahu, ma nke akara akàrà, nke ihe-ya enyere n'iwu na ukpuru-ya nile di nime ya, ma nke ghere oghe:

12. m'we were akwukwọ nzuta-ala ahu nye Beruk nwa Neraia, nwa Mahseia, n'anya Hanamel nwa nwa-nne nnam, na n'anya ndi-àmà ndi deworo aha-ha n'akwukwọ nzuta-ala ahu, n'anya ndi-Ju nile ndi nānọdu ala n'ogige ulo-nche ahu.

13. M'we nye Beruk iwu n'anya ha, si,

14. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Chiri akwukwọ ndia, bú akwukwọ nzuta-ala nka, ma nke akara akàrà, ma akwukwọ a nke ghere oghe, tiye ha n'ite urọ; ka ha we digide ọtutu ubọchi.

15. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Agāzu kwa ulo na ubi na ubi-vine ọzọ n'ala nka.

16. M'we kpere Jehova ekpere, mb͕e m'nyesiri Beruk nwa Neraia akwukwọ nzuta-ala, ahu, si,

17. Ewo, Onye-nwe-ayi Jehova! le, Gi onwe-gi emewo elu-igwe na uwa site n'ike uku Gi na site n'ogwe-aka-Gi eseteri eseti: ọ dighi ihe ọ bula kariri Gi ime:

18. Gi onye nēmere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nākwughachi ajọ omume nke ndi bu nna n'obi umu-ha gēsota ha n'azu: Chineke uku, nke bu dike, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya:

19. I di uku na ndum-ọdu, di kwa ike n'omume: Onye anya-Gi ghere oghe ilekwasi uzọ nile nke umu madu; inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, na dika nkpuru omume-ya nile si di:

20. Onye doro ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n'ala Ijipt, rue ta, ma n'etiti Israel ma n'etiti madu ọzọ; I we mere Onwe-gi aha, dika ta;

21. I we ji ihe-iriba-ama di iche iche, ji kwa ihe-ebude di iche iche, ji kwa aka di ike, ji kwa ogwe-aka setiri eseti, ji kwa egwu di uku, me ka ndi-Gi, bú Israel, si n'ala Ijipt puta;

22. I we nye ha ala nka, nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya;

23. ha we bata, nweta ya; ma ha egeghi nti olu-Gi, ọ bu kwa n'iwu-Gi ka ha nējegharighi; n'ihe nile nke I nyere ha n'iwu ime ọ dighi nke ha meworo: I we me ka ihe ọjọ a nile dakwasi ha:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 32