Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 32:39-44 Bible Nso (IGBOB)

39. M'gēnye kwa ha otù obi na otù uzọ, itu egwu Mu onwem ubọchi nile; ka o we diri ha, di-kwa-ra umu-ha ndi gānọchi ha, nma:

40. Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gaghi-esi n'iso ha ime ha nma laghachi azu; ma egwum ka M'gētiye n'obi-ha, ka ha we ghara isi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha.

41. Obi gātọkwam utọ n'aru ha ime ha nma, M'gēji kwa obim nile, ji kwa nkpuru-obim nile, kua ha n'ala nka n'ezie dika osisi.

42. N'ihi na otú a ka Jehova siri: Dika M'meworo ka ihe ọjọ uku a nile biakute ndi nka, otú a ka Mu onwem nēme ka ezi ihe ahu nile biakwasi ha, bú nke Mu onwem nēkwu bayere ha.

43. Agāzú kwa ọhia n'ala nka, nke unu onwe-unu nāsi, Nkpọnkpọ ebe ka ọ bu, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu bi nime ya; enyewo ya n'aka ndi Kaldea.

44. Ubi ka agāzú nēgo, de kwa aha n'akwukwọ-ha, ka kwa ha akàrà, kpọ kwa ndi-àmà, n'ala Benjamin, na n'ebe nile di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, na n'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 32